Jeremaya 2:9
Jeremiah 2:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nʼihi ya, aga m ebulite ebubo megide unu,”* Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. “M ga-ebulikwa ebubo megide ụmụ ụmụ unu.
Jeremiah 2:9 in English
Jeremiah 2:9 · Berean Standard Bible
Therefore, I will contend with you again, declares the LORD, and I will bring a case against your children’s children.
Context
7Ọ bụ m kpọbatara unu nʼala na-amị ọtụtụ mkpụrụ,
ka unu rie ihe dị ukwuu na ihe dị mma si nʼime ya.
Ma unu bara merụọ ala m
unu mere ihe nketa m ka ọ ghọọ ihe arụ. 8Ndị nchụaja ajụghị sị,
‘Olee ebe Onyenwe anyị nọ?’
Ndị ikpe ha amaghị m,
ndị na-achị ha mehiere megide m,
ndị amụma ha bụkwa aha Baal ka ha ji ebu amụma,
ha gbasooro ihe na-enweghị isi. 9“Nʼihi ya, aga m ebulite ebubo megide unu,”*
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
“M ga-ebulikwa ebubo megide ụmụ ụmụ unu. 10Gafee nʼọnụ mmiri Saiprọs lee anya,
zie ozi gaa Keda ma leruo anya nke ọma,
ma ị ga-ahụ ihe ọbụla yiri nke a. 11O nwerela mba gbanwere chi ndị ha na-efe?
(Ọ bụ ezie na ha abụghị chi.)
Ma ndị m ewerela arụsị na-enweghị isi
gbanwere ebube ha.*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.