Jeremaya 2:8
Jeremiah 2:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị nchụaja ajụghị sị, ‘Olee ebe Onyenwe anyị nọ?’ Ndị ikpe ha amaghị m, ndị na-achị ha mehiere megide m, ndị amụma ha bụkwa aha Baal ka ha ji ebu amụma, ha gbasooro ihe na-enweghị isi.
Jeremiah 2:8 in English
Jeremiah 2:8 · Berean Standard Bible
The priests did not ask, ‘Where is the LORD?’ The experts in the law no longer knew Me, and the leaders rebelled against Me. The prophets prophesied by Baal and followed useless idols.
Context
6Ha ajụghị ‘Olee ebe Onyenwe anyị ahụ nọ,
bụ onye sitere nʼala Ijipt kpọpụta anyị,
duuru anyị gafee ọzara tọgbọrọ nʼefu,
nʼala ọzara na ala olulu jupụtara,
ala nke akpịrị ịkpọ nkụ na nke oke ọchịchịrị,
ala ebe ọ dịghị onye na-esi na ya agafee na nke mmadụ na-ebighị na ya?’ 7Ọ bụ m kpọbatara unu nʼala na-amị ọtụtụ mkpụrụ,
ka unu rie ihe dị ukwuu na ihe dị mma si nʼime ya.
Ma unu bara merụọ ala m
unu mere ihe nketa m ka ọ ghọọ ihe arụ. 8Ndị nchụaja ajụghị sị,
‘Olee ebe Onyenwe anyị nọ?’
Ndị ikpe ha amaghị m,
ndị na-achị ha mehiere megide m,
ndị amụma ha bụkwa aha Baal ka ha ji ebu amụma,
ha gbasooro ihe na-enweghị isi. 9“Nʼihi ya, aga m ebulite ebubo megide unu,”*
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
“M ga-ebulikwa ebubo megide ụmụ ụmụ unu. 10Gafee nʼọnụ mmiri Saiprọs lee anya,
zie ozi gaa Keda ma leruo anya nke ọma,
ma ị ga-ahụ ihe ọbụla yiri nke a.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.