Native Bible

Jeremiah 2:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọzọkwa, ndị ikom Memfis na Tapanhis a kupuola gị isi.

Jeremiah 2:16 in English

Jeremiah 2:16 · Berean Standard Bible

The men of Memphis * and Tahpanhes have shaved the crown of your head.

Context

14Izrel ọ bụ ohu, ka ọ bụ ohu a mụrụ nʼụlọ? Gịnị mere o ji ghọọ ihe nlụta nʼagha? 15Ọdụm agbọọla ụja, ha ebigbọọla meekwa ka ọ nụ olu ha. Ha ebibiela obodo ya laa ya nʼiyi, suo ya ọkụ, nke mere na o nweghị onye bi na ha. 16Ọzọkwa, ndị ikom Memfis na Tapanhis a kupuola gị isi. 17Ọ bụghị unu onwe unu wetaara onwe unu ihe ọjọọ dị otu a site na ịhapụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu, mgbe ọ na-edu unu na-aga nʼụzọ? 18Ugbu a, gịnị bụ uru unu nwetara site nʼịga Ijipt sitekwa nʼịṅụ mmiri nke osimiri Naịl? Gịnị bụ uru unu nwetara site nʼịga Asịrịa, sitekwa nʼịṅụ mmiri si na Yufretis?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.