Jeremaya 10:17
Jeremiah 10:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Chịkọtaanụ ngwongwo unu niile; nọọnụ na njikere ịhapụ ala a, nʼihi na lee, ndị iro gbara unu gburugburu.
Jeremiah 10:17 in English
Jeremiah 10:17 · Berean Standard Bible
Gather up your belongings from this land, you who live under siege.
Context
15Ha bụ ihe efu, na ihe ịkwa emo,
mgbe ikpe ọmụma ha bịakwasịrị ha, ha ga-ala nʼiyi. 16Ma Onye ahụ bụ Oke Jekọb adịghị ka ihe ndị a,
nʼihi na Ọ bụ ya na-eke ihe niile,
tinyere Izrel bụ ebo nke ihe nketa ya.
Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụ aha ya. 17Chịkọtaanụ ngwongwo unu niile; nọọnụ na njikere ịhapụ ala a,
nʼihi na lee, ndị iro gbara unu gburugburu. 18Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,
“Nʼoge a, aga m amafu
ndị niile bi nʼala a.
M ga-eme ka oke mkpagbu bịakwasị ha,
meekwa ka ndị iro ha jide ha.” 19Ahụhụ dịịrị m nʼihi mmerụ ahụ m merụrụ.
Ọnya dị m nʼahụ enweghị ọgwụgwọ.
Ma ana m akasị onwe m obi na-asị,
“Nʼezie, ọrịa a dakwasịrị m bụ ọrịa m, aga m edikwa ya.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.