Jeremaya 10:15
Jeremiah 10:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha bụ ihe efu, na ihe ịkwa emo, mgbe ikpe ọmụma ha bịakwasịrị ha, ha ga-ala nʼiyi.
Jeremiah 10:15 in English
Jeremiah 10:15 · Berean Standard Bible
They are worthless, a work to be mocked. In the time of their punishment they will perish.
Context
13Mgbe o bigbọrọ, mmiri niile nke dị nʼeluigwe na-ebigbọkwa.
Ọ na-eme ka igwe ojii site na nsọtụ niile nke ụwa kwụlie.
Ọ na-ezipụ amụma mgbe mmiri na-ezo,
na-esitekwa nʼụlọ nkwakọba ihe ya niile na-ewepụta ifufe. 14Onye ọbụla bụ onye na-enweghị uche nke ihe ọmụma kọrọ.
Emeela ka ihere mee onye ọkpụ ụzụ ọlaedo ọbụla site nʼarụsị ọ kpụrụ.
Nʼihi na oyiyi niile ọ na-akpụ bụ aghụghọ;
ha enweghị nkuume ọbụla nʼime ha. 15Ha bụ ihe efu, na ihe ịkwa emo,
mgbe ikpe ọmụma ha bịakwasịrị ha, ha ga-ala nʼiyi. 16Ma Onye ahụ bụ Oke Jekọb adịghị ka ihe ndị a,
nʼihi na Ọ bụ ya na-eke ihe niile,
tinyere Izrel bụ ebo nke ihe nketa ya.
Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụ aha ya. 17Chịkọtaanụ ngwongwo unu niile; nọọnụ na njikere ịhapụ ala a,
nʼihi na lee, ndị iro gbara unu gburugburu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.