Native Bible

Jeremiah 10:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma Onye ahụ bụ Oke Jekọb adịghị ka ihe ndị a, nʼihi na Ọ bụ ya na-eke ihe niile, tinyere Izrel bụ ebo nke ihe nketa ya. Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụ aha ya.

Jeremiah 10:16 in English

Jeremiah 10:16 · Berean Standard Bible

The Portion of Jacob is not like these, for He is the Maker of all things, and Israel is the tribe of His inheritance— the LORD of Hosts is His name.

Context

14Onye ọbụla bụ onye na-enweghị uche nke ihe ọmụma kọrọ. Emeela ka ihere mee onye ọkpụ ụzụ ọlaedo ọbụla site nʼarụsị ọ kpụrụ. Nʼihi na oyiyi niile ọ na-akpụ bụ aghụghọ; ha enweghị nkuume ọbụla nʼime ha. 15Ha bụ ihe efu, na ihe ịkwa emo, mgbe ikpe ọmụma ha bịakwasịrị ha, ha ga-ala nʼiyi. 16Ma Onye ahụ bụ Oke Jekọb adịghị ka ihe ndị a, nʼihi na Ọ bụ ya na-eke ihe niile, tinyere Izrel bụ ebo nke ihe nketa ya. Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụ aha ya. 17Chịkọtaanụ ngwongwo unu niile; nọọnụ na njikere ịhapụ ala a, nʼihi na lee, ndị iro gbara unu gburugburu. 18Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Nʼoge a, aga m amafu ndị niile bi nʼala a. M ga-eme ka oke mkpagbu bịakwasị ha, meekwa ka ndị iro ha jide ha.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.