Jeremaya 10:18
Jeremiah 10:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Nʼoge a, aga m amafu ndị niile bi nʼala a. M ga-eme ka oke mkpagbu bịakwasị ha, meekwa ka ndị iro ha jide ha.”
Jeremiah 10:18 in English
Jeremiah 10:18 · Berean Standard Bible
For this is what the LORD says: “Behold, at this time I will sling out the inhabitants of the land and bring distress upon them so that they may be captured.”
Context
16Ma Onye ahụ bụ Oke Jekọb adịghị ka ihe ndị a,
nʼihi na Ọ bụ ya na-eke ihe niile,
tinyere Izrel bụ ebo nke ihe nketa ya.
Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụ aha ya. 17Chịkọtaanụ ngwongwo unu niile; nọọnụ na njikere ịhapụ ala a,
nʼihi na lee, ndị iro gbara unu gburugburu. 18Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,
“Nʼoge a, aga m amafu
ndị niile bi nʼala a.
M ga-eme ka oke mkpagbu bịakwasị ha,
meekwa ka ndị iro ha jide ha.” 19Ahụhụ dịịrị m nʼihi mmerụ ahụ m merụrụ.
Ọnya dị m nʼahụ enweghị ọgwụgwọ.
Ma ana m akasị onwe m obi na-asị,
“Nʼezie, ọrịa a dakwasịrị m bụ ọrịa m, aga m edikwa ya.” 20Ebibiela ụlọ ikwu m,
e tibisiala ụdọ ya niile.
Ụmụ m ndị ikom esitela nʼebe m nọ pụọ, ha anọkwaghị ya.
Ọ dịkwaghị onye fọdụrụ nke ga-enyere m aka isetipụ ụlọ ikwu m,
maọbụ onye ga-edoziri m ebe m ga-anọ zuo ike.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.