Jeremaya 10:20
Jeremiah 10:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ebibiela ụlọ ikwu m, e tibisiala ụdọ ya niile. Ụmụ m ndị ikom esitela nʼebe m nọ pụọ, ha anọkwaghị ya. Ọ dịkwaghị onye fọdụrụ nke ga-enyere m aka isetipụ ụlọ ikwu m, maọbụ onye ga-edoziri m ebe m ga-anọ zuo ike.
Jeremiah 10:20 in English
Jeremiah 10:20 · Berean Standard Bible
My tent is destroyed, and all its ropes are snapped. My sons have departed from me and are no more. I have no one left to pitch my tent or set up my curtains.
Context
18Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,
“Nʼoge a, aga m amafu
ndị niile bi nʼala a.
M ga-eme ka oke mkpagbu bịakwasị ha,
meekwa ka ndị iro ha jide ha.” 19Ahụhụ dịịrị m nʼihi mmerụ ahụ m merụrụ.
Ọnya dị m nʼahụ enweghị ọgwụgwọ.
Ma ana m akasị onwe m obi na-asị,
“Nʼezie, ọrịa a dakwasịrị m bụ ọrịa m, aga m edikwa ya.” 20Ebibiela ụlọ ikwu m,
e tibisiala ụdọ ya niile.
Ụmụ m ndị ikom esitela nʼebe m nọ pụọ, ha anọkwaghị ya.
Ọ dịkwaghị onye fọdụrụ nke ga-enyere m aka isetipụ ụlọ ikwu m,
maọbụ onye ga-edoziri m ebe m ga-anọ zuo ike. 21Nʼihi na ndị ọzụzụ atụrụ a enweghị uche.
Ha adịghị ajụta ase site nʼaka Onyenwe anyị,
ya mere, na ihe adịghị agara ha nke ọma,
igwe atụrụ ha niile agbasasịakwala. 22Gee ntị, nụrụ! Lee ozi na-abịa,
oke ụzụ nke ọgbaaghara site nʼala dị nʼugwu,
ime ka obodo niile nke Juda tọgbọrọ nʼefu,
ghọọkwa ebe obibi nye nkịta ọhịa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.