Native Bible

Jeremiah 10:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ahụhụ dịịrị m nʼihi mmerụ ahụ m merụrụ. Ọnya dị m nʼahụ enweghị ọgwụgwọ. Ma ana m akasị onwe m obi na-asị, “Nʼezie, ọrịa a dakwasịrị m bụ ọrịa m, aga m edikwa ya.”

Jeremiah 10:19 in English

Jeremiah 10:19 · Berean Standard Bible

Woe to me because of my brokenness; my wound is grievous! But I said, “This is truly my sickness, and I must bear it.”

Context

17Chịkọtaanụ ngwongwo unu niile; nọọnụ na njikere ịhapụ ala a, nʼihi na lee, ndị iro gbara unu gburugburu. 18Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Nʼoge a, aga m amafu ndị niile bi nʼala a. M ga-eme ka oke mkpagbu bịakwasị ha, meekwa ka ndị iro ha jide ha.” 19Ahụhụ dịịrị m nʼihi mmerụ ahụ m merụrụ. Ọnya dị m nʼahụ enweghị ọgwụgwọ. Ma ana m akasị onwe m obi na-asị, “Nʼezie, ọrịa a dakwasịrị m bụ ọrịa m, aga m edikwa ya.” 20Ebibiela ụlọ ikwu m, e tibisiala ụdọ ya niile. Ụmụ m ndị ikom esitela nʼebe m nọ pụọ, ha anọkwaghị ya. Ọ dịkwaghị onye fọdụrụ nke ga-enyere m aka isetipụ ụlọ ikwu m, maọbụ onye ga-edoziri m ebe m ga-anọ zuo ike. 21Nʼihi na ndị ọzụzụ atụrụ a enweghị uche. Ha adịghị ajụta ase site nʼaka Onyenwe anyị, ya mere, na ihe adịghị agara ha nke ọma, igwe atụrụ ha niile agbasasịakwala.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.