Jeremaya 10:19
Jeremiah 10:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ahụhụ dịịrị m nʼihi mmerụ ahụ m merụrụ. Ọnya dị m nʼahụ enweghị ọgwụgwọ. Ma ana m akasị onwe m obi na-asị, “Nʼezie, ọrịa a dakwasịrị m bụ ọrịa m, aga m edikwa ya.”
Jeremiah 10:19 in English
Jeremiah 10:19 · Berean Standard Bible
Woe to me because of my brokenness; my wound is grievous! But I said, “This is truly my sickness, and I must bear it.”
Context
17Chịkọtaanụ ngwongwo unu niile; nọọnụ na njikere ịhapụ ala a,
nʼihi na lee, ndị iro gbara unu gburugburu. 18Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,
“Nʼoge a, aga m amafu
ndị niile bi nʼala a.
M ga-eme ka oke mkpagbu bịakwasị ha,
meekwa ka ndị iro ha jide ha.” 19Ahụhụ dịịrị m nʼihi mmerụ ahụ m merụrụ.
Ọnya dị m nʼahụ enweghị ọgwụgwọ.
Ma ana m akasị onwe m obi na-asị,
“Nʼezie, ọrịa a dakwasịrị m bụ ọrịa m, aga m edikwa ya.” 20Ebibiela ụlọ ikwu m,
e tibisiala ụdọ ya niile.
Ụmụ m ndị ikom esitela nʼebe m nọ pụọ, ha anọkwaghị ya.
Ọ dịkwaghị onye fọdụrụ nke ga-enyere m aka isetipụ ụlọ ikwu m,
maọbụ onye ga-edoziri m ebe m ga-anọ zuo ike. 21Nʼihi na ndị ọzụzụ atụrụ a enweghị uche.
Ha adịghị ajụta ase site nʼaka Onyenwe anyị,
ya mere, na ihe adịghị agara ha nke ọma,
igwe atụrụ ha niile agbasasịakwala.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.