Native Bible

Isaiah 33:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma Onyenwe anyị na-asị, “Ugbu a, m ga-ebili.” “Ugbu a, ka a ga-eme ka m dị elu;* ugbu a, ka a ga-ebuli m elu.

Isaiah 33:10 in English

Isaiah 33:10 · Berean Standard Bible

“Now I will arise,” says the LORD. “Now I will lift Myself up. Now I will be exalted.

Context

8Ọ dịkwaghị onye a na-ahụ anya nʼokporoụzọ ọbụla. E meela ka ọgbụgba ndụ niile ghara ịdịkwa ire. A na-elelị ndị e sitere nʼakaebe ha mee ka ọgbụgba ndụ ahụ guzosie ike. Ọ dịkwaghị onye a na-asọpụrụ. 9Ala ahụ niile na-eru ụjụ. Ọ tọgbọkwara nʼefu. Oke ọhịa Lebanọn akpọnwụọla bụrụ ihe ihere. Sharọn aghọkwaala ọzara; osisi dị na Bashan na nʼelu ugwu Kamel na-agbụchakwa akwụkwọ ha. 10Ma Onyenwe anyị na-asị, “Ugbu a, m ga-ebili.” “Ugbu a, ka a ga-eme ka m dị elu;* ugbu a, ka a ga-ebuli m elu. 11Unu na-atụ ime ahịhịa kpọrọ nkụ, unu na-amụpụta ahịhịa, nkuume unu na-ekupụta bụ ọkụ ga-erepịa unu. 12Ndị gị ga-ere ọkụ, dịka osisi ogwu e gbuturu egbutu tụnye nʼọkụ; ha ga-ere ọkụ dịka avụvụ nkwụ.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.