Aịzaya 33:8
Isaiah 33:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ dịkwaghị onye a na-ahụ anya nʼokporoụzọ ọbụla. E meela ka ọgbụgba ndụ niile ghara ịdịkwa ire. A na-elelị ndị e sitere nʼakaebe ha mee ka ọgbụgba ndụ ahụ guzosie ike. Ọ dịkwaghị onye a na-asọpụrụ.
Isaiah 33:8 in English
Isaiah 33:8 · Berean Standard Bible
The highways are deserted; travel has ceased. The treaty * has been broken, the witnesses * are despised, and human life is disregarded.
Context
6Ọ ga-abụ ntọala guzosiri ike nke oge unu niile,
ụlọakụ dị ukwu nke nzọpụta, na amamihe na ihe ọmụma;
egwu Onyenwe anyị bụ igodo nke akụ a. 7Lee ndị ha dị ike ka ha na-eti mkpu akwa nʼokporoụzọ niile;
ndị na-anọchite anya ha, ndị bịara ikwu otu udo ga-esi dịrị na-akwa akwa. 8Ọ dịkwaghị onye a na-ahụ anya nʼokporoụzọ ọbụla.
E meela ka ọgbụgba ndụ niile ghara ịdịkwa ire.
A na-elelị ndị e sitere nʼakaebe ha
mee ka ọgbụgba ndụ ahụ guzosie ike.
Ọ dịkwaghị onye a na-asọpụrụ. 9Ala ahụ niile na-eru ụjụ. Ọ tọgbọkwara nʼefu.
Oke ọhịa Lebanọn akpọnwụọla bụrụ ihe ihere.
Sharọn aghọkwaala ọzara;
osisi dị na Bashan na nʼelu ugwu Kamel na-agbụchakwa akwụkwọ ha. 10Ma Onyenwe anyị na-asị, “Ugbu a, m ga-ebili.”
“Ugbu a, ka a ga-eme ka m dị elu;*
ugbu a, ka a ga-ebuli m elu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.