Aịzaya 33:9
Isaiah 33:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ala ahụ niile na-eru ụjụ. Ọ tọgbọkwara nʼefu. Oke ọhịa Lebanọn akpọnwụọla bụrụ ihe ihere. Sharọn aghọkwaala ọzara; osisi dị na Bashan na nʼelu ugwu Kamel na-agbụchakwa akwụkwọ ha.
Isaiah 33:9 in English
Isaiah 33:9 · Berean Standard Bible
The land mourns and languishes; Lebanon is ashamed and decayed. Sharon is like a desert; Bashan and Carmel shake off their leaves.
Context
7Lee ndị ha dị ike ka ha na-eti mkpu akwa nʼokporoụzọ niile;
ndị na-anọchite anya ha, ndị bịara ikwu otu udo ga-esi dịrị na-akwa akwa. 8Ọ dịkwaghị onye a na-ahụ anya nʼokporoụzọ ọbụla.
E meela ka ọgbụgba ndụ niile ghara ịdịkwa ire.
A na-elelị ndị e sitere nʼakaebe ha
mee ka ọgbụgba ndụ ahụ guzosie ike.
Ọ dịkwaghị onye a na-asọpụrụ. 9Ala ahụ niile na-eru ụjụ. Ọ tọgbọkwara nʼefu.
Oke ọhịa Lebanọn akpọnwụọla bụrụ ihe ihere.
Sharọn aghọkwaala ọzara;
osisi dị na Bashan na nʼelu ugwu Kamel na-agbụchakwa akwụkwọ ha. 10Ma Onyenwe anyị na-asị, “Ugbu a, m ga-ebili.”
“Ugbu a, ka a ga-eme ka m dị elu;*
ugbu a, ka a ga-ebuli m elu. 11Unu na-atụ ime ahịhịa kpọrọ nkụ,
unu na-amụpụta ahịhịa,
nkuume unu na-ekupụta bụ ọkụ ga-erepịa unu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.