Aịzaya 33:7
Isaiah 33:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Lee ndị ha dị ike ka ha na-eti mkpu akwa nʼokporoụzọ niile; ndị na-anọchite anya ha, ndị bịara ikwu otu udo ga-esi dịrị na-akwa akwa.
Isaiah 33:7 in English
Isaiah 33:7 · Berean Standard Bible
Behold, their valiant ones cry aloud in the streets; the envoys of peace weep bitterly.
Context
5Onyenwe anyị dị elu, nʼihi na o bi nʼebe dị elu.
Ọ ga-eji ikpe ya ziri ezi, na ezi omume mejupụta Zayọn. 6Ọ ga-abụ ntọala guzosiri ike nke oge unu niile,
ụlọakụ dị ukwu nke nzọpụta, na amamihe na ihe ọmụma;
egwu Onyenwe anyị bụ igodo nke akụ a. 7Lee ndị ha dị ike ka ha na-eti mkpu akwa nʼokporoụzọ niile;
ndị na-anọchite anya ha, ndị bịara ikwu otu udo ga-esi dịrị na-akwa akwa. 8Ọ dịkwaghị onye a na-ahụ anya nʼokporoụzọ ọbụla.
E meela ka ọgbụgba ndụ niile ghara ịdịkwa ire.
A na-elelị ndị e sitere nʼakaebe ha
mee ka ọgbụgba ndụ ahụ guzosie ike.
Ọ dịkwaghị onye a na-asọpụrụ. 9Ala ahụ niile na-eru ụjụ. Ọ tọgbọkwara nʼefu.
Oke ọhịa Lebanọn akpọnwụọla bụrụ ihe ihere.
Sharọn aghọkwaala ọzara;
osisi dị na Bashan na nʼelu ugwu Kamel na-agbụchakwa akwụkwọ ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.