Native Bible

Isaiah 33:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ ga-abụ ntọala guzosiri ike nke oge unu niile, ụlọakụ dị ukwu nke nzọpụta, na amamihe na ihe ọmụma; egwu Onyenwe anyị bụ igodo nke akụ a.

Isaiah 33:6 in English

Isaiah 33:6 · Berean Standard Bible

He will be the sure foundation for your times, a storehouse of salvation, wisdom, and knowledge. The fear of the LORD is Zion’s treasure.

Context

4Dịka igurube si atachapụ ihe dị nʼubi, otu a ka a ga-esi kwakọrọ ihe niile unu nwere nʼagha, unu mba dị iche iche. 5Onyenwe anyị dị elu, nʼihi na o bi nʼebe dị elu. Ọ ga-eji ikpe ya ziri ezi, na ezi omume mejupụta Zayọn. 6Ọ ga-abụ ntọala guzosiri ike nke oge unu niile, ụlọakụ dị ukwu nke nzọpụta, na amamihe na ihe ọmụma; egwu Onyenwe anyị bụ igodo nke akụ a. 7Lee ndị ha dị ike ka ha na-eti mkpu akwa nʼokporoụzọ niile; ndị na-anọchite anya ha, ndị bịara ikwu otu udo ga-esi dịrị na-akwa akwa. 8Ọ dịkwaghị onye a na-ahụ anya nʼokporoụzọ ọbụla. E meela ka ọgbụgba ndụ niile ghara ịdịkwa ire. A na-elelị ndị e sitere nʼakaebe ha mee ka ọgbụgba ndụ ahụ guzosie ike. Ọ dịkwaghị onye a na-asọpụrụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.