Aịzaya 33:4
Isaiah 33:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Dịka igurube si atachapụ ihe dị nʼubi, otu a ka a ga-esi kwakọrọ ihe niile unu nwere nʼagha, unu mba dị iche iche.
Isaiah 33:4 in English
Isaiah 33:4 · Berean Standard Bible
Your spoil, O nations, * is gathered as by locusts; like a swarm of locusts men sweep over it.
Context
2Biko, Onyenwe anyị, nwee obi ebere nʼebe anyị nọ,
nʼihi na ọ bụ gị ka anyị na-ele anya.
Bụụrụ anyị ike nʼụtụtụ ụbọchị niile,
bụrụkwara anyị onye nzọpụta mgbe niile anyị nọ na mkpa. 3Ndị iro na-agba ọsọ mgbe ha nụrụ olu gị.
Mgbe ị guzoro ọtọ, mba niile na-agbalaga. 4Dịka igurube si atachapụ ihe dị nʼubi,
otu a ka a ga-esi kwakọrọ ihe niile unu nwere nʼagha, unu mba dị iche iche. 5Onyenwe anyị dị elu, nʼihi na o bi nʼebe dị elu.
Ọ ga-eji ikpe ya ziri ezi, na ezi omume mejupụta Zayọn. 6Ọ ga-abụ ntọala guzosiri ike nke oge unu niile,
ụlọakụ dị ukwu nke nzọpụta, na amamihe na ihe ọmụma;
egwu Onyenwe anyị bụ igodo nke akụ a.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.