Aịzaya 33:2
Isaiah 33:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Biko, Onyenwe anyị, nwee obi ebere nʼebe anyị nọ, nʼihi na ọ bụ gị ka anyị na-ele anya. Bụụrụ anyị ike nʼụtụtụ ụbọchị niile, bụrụkwara anyị onye nzọpụta mgbe niile anyị nọ na mkpa.
Isaiah 33:2 in English
Isaiah 33:2 · Berean Standard Bible
O LORD, be gracious to us! We wait for You. Be our strength every morning and our salvation in time of trouble.
Context
1Ahụhụ dịrị gị, onye mbibi,
onye bibiri ihe niile dị gị gburugburu, ma ọ dịbeghị mbibi rutere gị aka.
Ahụhụ dịrị gị, onye nrafu,
onye na-enwebeghị ndị rafuru gị.
Mgbe ị kwụsịrị ibibi ihe
ka a ga-ebibi gị,
mgbe ị kwụsịkwara nrafu
ka a ga-arafu gị. 2Biko, Onyenwe anyị, nwee obi ebere nʼebe anyị nọ,
nʼihi na ọ bụ gị ka anyị na-ele anya.
Bụụrụ anyị ike nʼụtụtụ ụbọchị niile,
bụrụkwara anyị onye nzọpụta mgbe niile anyị nọ na mkpa. 3Ndị iro na-agba ọsọ mgbe ha nụrụ olu gị.
Mgbe ị guzoro ọtọ, mba niile na-agbalaga. 4Dịka igurube si atachapụ ihe dị nʼubi,
otu a ka a ga-esi kwakọrọ ihe niile unu nwere nʼagha, unu mba dị iche iche.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.