Native Bible

Isaiah 33:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ahụhụ dịrị gị, onye mbibi, onye bibiri ihe niile dị gị gburugburu, ma ọ dịbeghị mbibi rutere gị aka. Ahụhụ dịrị gị, onye nrafu, onye na-enwebeghị ndị rafuru gị. Mgbe ị kwụsịrị ibibi ihe ka a ga-ebibi gị, mgbe ị kwụsịkwara nrafu ka a ga-arafu gị.

Isaiah 33:1 in English

Isaiah 33:1 · Berean Standard Bible

Woe to you, O destroyer never destroyed, O traitor never betrayed! When you have finished destroying, you will be destroyed. When you have finished betraying, you will be betrayed.

Context

1Ahụhụ dịrị gị, onye mbibi, onye bibiri ihe niile dị gị gburugburu, ma ọ dịbeghị mbibi rutere gị aka. Ahụhụ dịrị gị, onye nrafu, onye na-enwebeghị ndị rafuru gị. Mgbe ị kwụsịrị ibibi ihe ka a ga-ebibi gị, mgbe ị kwụsịkwara nrafu ka a ga-arafu gị. 2Biko, Onyenwe anyị, nwee obi ebere nʼebe anyị nọ, nʼihi na ọ bụ gị ka anyị na-ele anya. Bụụrụ anyị ike nʼụtụtụ ụbọchị niile, bụrụkwara anyị onye nzọpụta mgbe niile anyị nọ na mkpa. 3Ndị iro na-agba ọsọ mgbe ha nụrụ olu gị. Mgbe ị guzoro ọtọ, mba niile na-agbalaga.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.