Native Bible

Isaiah 33:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị iro na-agba ọsọ mgbe ha nụrụ olu gị. Mgbe ị guzoro ọtọ, mba niile na-agbalaga.

Isaiah 33:3 in English

Isaiah 33:3 · Berean Standard Bible

The peoples flee the thunder of Your voice; the nations scatter when You rise.

Context

1Ahụhụ dịrị gị, onye mbibi, onye bibiri ihe niile dị gị gburugburu, ma ọ dịbeghị mbibi rutere gị aka. Ahụhụ dịrị gị, onye nrafu, onye na-enwebeghị ndị rafuru gị. Mgbe ị kwụsịrị ibibi ihe ka a ga-ebibi gị, mgbe ị kwụsịkwara nrafu ka a ga-arafu gị. 2Biko, Onyenwe anyị, nwee obi ebere nʼebe anyị nọ, nʼihi na ọ bụ gị ka anyị na-ele anya. Bụụrụ anyị ike nʼụtụtụ ụbọchị niile, bụrụkwara anyị onye nzọpụta mgbe niile anyị nọ na mkpa. 3Ndị iro na-agba ọsọ mgbe ha nụrụ olu gị. Mgbe ị guzoro ọtọ, mba niile na-agbalaga. 4Dịka igurube si atachapụ ihe dị nʼubi, otu a ka a ga-esi kwakọrọ ihe niile unu nwere nʼagha, unu mba dị iche iche. 5Onyenwe anyị dị elu, nʼihi na o bi nʼebe dị elu. Ọ ga-eji ikpe ya ziri ezi, na ezi omume mejupụta Zayọn.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.