Aịzaya 33:11
Isaiah 33:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Unu na-atụ ime ahịhịa kpọrọ nkụ, unu na-amụpụta ahịhịa, nkuume unu na-ekupụta bụ ọkụ ga-erepịa unu.
Isaiah 33:11 in English
Isaiah 33:11 · Berean Standard Bible
You conceive chaff; you give birth to stubble. Your breath is a fire that will consume you.
Context
9Ala ahụ niile na-eru ụjụ. Ọ tọgbọkwara nʼefu.
Oke ọhịa Lebanọn akpọnwụọla bụrụ ihe ihere.
Sharọn aghọkwaala ọzara;
osisi dị na Bashan na nʼelu ugwu Kamel na-agbụchakwa akwụkwọ ha. 10Ma Onyenwe anyị na-asị, “Ugbu a, m ga-ebili.”
“Ugbu a, ka a ga-eme ka m dị elu;*
ugbu a, ka a ga-ebuli m elu. 11Unu na-atụ ime ahịhịa kpọrọ nkụ,
unu na-amụpụta ahịhịa,
nkuume unu na-ekupụta bụ ọkụ ga-erepịa unu. 12Ndị gị ga-ere ọkụ, dịka osisi ogwu e gbuturu egbutu tụnye nʼọkụ;
ha ga-ere ọkụ dịka avụvụ nkwụ.” 13Geenụ ntị nụrụ ihe m mere, unu mba niile dị nʼebe dị anya!
Unu ndị nọ nso, kwerenụ nʼezie na m siri ike!
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.