Native Bible

Isaiah 33:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Geenụ ntị nụrụ ihe m mere, unu mba niile dị nʼebe dị anya! Unu ndị nọ nso, kwerenụ nʼezie na m siri ike!

Isaiah 33:13 in English

Isaiah 33:13 · Berean Standard Bible

You who are far off, hear what I have done; you who are near, acknowledge My might.”

Context

11Unu na-atụ ime ahịhịa kpọrọ nkụ, unu na-amụpụta ahịhịa, nkuume unu na-ekupụta bụ ọkụ ga-erepịa unu. 12Ndị gị ga-ere ọkụ, dịka osisi ogwu e gbuturu egbutu tụnye nʼọkụ; ha ga-ere ọkụ dịka avụvụ nkwụ.” 13Geenụ ntị nụrụ ihe m mere, unu mba niile dị nʼebe dị anya! Unu ndị nọ nso, kwerenụ nʼezie na m siri ike! 14Ndị mmehie na ndị ajọ omume nọ na Zayọn na-ama jijiji nʼegwu, ha na-akwa akwa na-asị, “Onye nʼime anyị pụrụ ibi nʼebe a, nʼetiti onye a bụ ọkụ na-erepịa erepịa, ọkụ nke na-ere ruo mgbe ebighị ebi?” 15Ndị na-ejegharị nʼezi omume na-ekwu ihe ziri ezi, ndị na-ajụ uru sitere nʼụzọ nʼezighị ezi, ndị na-ewezuga aka ha site na ịnata ngarị dị iche iche, ndị na-emechi ntị megide izu ịkwafu ọbara, na-amụchi anya ha abụọ ka ha ghara ịtụgharị uche nʼihe ọjọọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.