Aịzaya 33:12
Isaiah 33:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị gị ga-ere ọkụ, dịka osisi ogwu e gbuturu egbutu tụnye nʼọkụ; ha ga-ere ọkụ dịka avụvụ nkwụ.”
Isaiah 33:12 in English
Isaiah 33:12 · Berean Standard Bible
The peoples will be burned to ashes, like thorns cut down and set ablaze.
Context
10Ma Onyenwe anyị na-asị, “Ugbu a, m ga-ebili.”
“Ugbu a, ka a ga-eme ka m dị elu;*
ugbu a, ka a ga-ebuli m elu. 11Unu na-atụ ime ahịhịa kpọrọ nkụ,
unu na-amụpụta ahịhịa,
nkuume unu na-ekupụta bụ ọkụ ga-erepịa unu. 12Ndị gị ga-ere ọkụ, dịka osisi ogwu e gbuturu egbutu tụnye nʼọkụ;
ha ga-ere ọkụ dịka avụvụ nkwụ.” 13Geenụ ntị nụrụ ihe m mere, unu mba niile dị nʼebe dị anya!
Unu ndị nọ nso, kwerenụ nʼezie na m siri ike! 14Ndị mmehie na ndị ajọ omume nọ na Zayọn na-ama jijiji nʼegwu,
ha na-akwa akwa na-asị,
“Onye nʼime anyị pụrụ ibi nʼebe a, nʼetiti onye a bụ ọkụ na-erepịa erepịa,
ọkụ nke na-ere ruo mgbe ebighị ebi?”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.