Aịzaya 33:14
Isaiah 33:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị mmehie na ndị ajọ omume nọ na Zayọn na-ama jijiji nʼegwu, ha na-akwa akwa na-asị, “Onye nʼime anyị pụrụ ibi nʼebe a, nʼetiti onye a bụ ọkụ na-erepịa erepịa, ọkụ nke na-ere ruo mgbe ebighị ebi?”
Isaiah 33:14 in English
Isaiah 33:14 · Berean Standard Bible
The sinners in Zion are afraid; trembling grips the ungodly: “Who of us can dwell with a consuming fire? Who of us can dwell with everlasting flames?”
Context
12Ndị gị ga-ere ọkụ, dịka osisi ogwu e gbuturu egbutu tụnye nʼọkụ;
ha ga-ere ọkụ dịka avụvụ nkwụ.” 13Geenụ ntị nụrụ ihe m mere, unu mba niile dị nʼebe dị anya!
Unu ndị nọ nso, kwerenụ nʼezie na m siri ike! 14Ndị mmehie na ndị ajọ omume nọ na Zayọn na-ama jijiji nʼegwu,
ha na-akwa akwa na-asị,
“Onye nʼime anyị pụrụ ibi nʼebe a, nʼetiti onye a bụ ọkụ na-erepịa erepịa,
ọkụ nke na-ere ruo mgbe ebighị ebi?” 15Ndị na-ejegharị nʼezi omume
na-ekwu ihe ziri ezi,
ndị na-ajụ uru sitere nʼụzọ nʼezighị ezi,
ndị na-ewezuga aka ha site na ịnata ngarị dị iche iche,
ndị na-emechi ntị megide izu ịkwafu ọbara,
na-amụchi anya ha abụọ ka ha ghara ịtụgharị uche nʼihe ọjọọ. 16Ha bụ ndị ahụ ga-ebi nʼebe dị elu,
ndị ebe mgbaba ha ga-abụ ebe e wusiri ike nke ugwu.
A ga-enye ha nri,
mmiri a gaghị akọkwa ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.