Native Bible

Isaiah 33:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha bụ ndị ahụ ga-ebi nʼebe dị elu, ndị ebe mgbaba ha ga-abụ ebe e wusiri ike nke ugwu. A ga-enye ha nri, mmiri a gaghị akọkwa ha.

Isaiah 33:16 in English

Isaiah 33:16 · Berean Standard Bible

he will dwell on the heights; the mountain fortress will be his refuge; his food will be provided and his water assured.

Context

14Ndị mmehie na ndị ajọ omume nọ na Zayọn na-ama jijiji nʼegwu, ha na-akwa akwa na-asị, “Onye nʼime anyị pụrụ ibi nʼebe a, nʼetiti onye a bụ ọkụ na-erepịa erepịa, ọkụ nke na-ere ruo mgbe ebighị ebi?” 15Ndị na-ejegharị nʼezi omume na-ekwu ihe ziri ezi, ndị na-ajụ uru sitere nʼụzọ nʼezighị ezi, ndị na-ewezuga aka ha site na ịnata ngarị dị iche iche, ndị na-emechi ntị megide izu ịkwafu ọbara, na-amụchi anya ha abụọ ka ha ghara ịtụgharị uche nʼihe ọjọọ. 16Ha bụ ndị ahụ ga-ebi nʼebe dị elu, ndị ebe mgbaba ha ga-abụ ebe e wusiri ike nke ugwu. A ga-enye ha nri, mmiri a gaghị akọkwa ha. 17Anya unu ga-ahụ eze nʼebube ya; unu ga-ahụkwa alaeze ya nke nsọtụ oke ya dị nʼebe dị anya. 18Nʼime echiche obi unu, unu ga na-atule ihe oke egwu nke oge ndị ahụ gara aga. “Olee ebe onyeisi ọchịchị ahụ nọ ugbu a? Ebee ka onye na-anakọta ụtụ ahụ nọ? Ebeekwa ka onyeisi ahụ nke ụlọ elu nche niile dị nʼaka ya nọ?”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.