Aịzaya 33:16
Isaiah 33:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha bụ ndị ahụ ga-ebi nʼebe dị elu, ndị ebe mgbaba ha ga-abụ ebe e wusiri ike nke ugwu. A ga-enye ha nri, mmiri a gaghị akọkwa ha.
Isaiah 33:16 in English
Isaiah 33:16 · Berean Standard Bible
he will dwell on the heights; the mountain fortress will be his refuge; his food will be provided and his water assured.
Context
14Ndị mmehie na ndị ajọ omume nọ na Zayọn na-ama jijiji nʼegwu,
ha na-akwa akwa na-asị,
“Onye nʼime anyị pụrụ ibi nʼebe a, nʼetiti onye a bụ ọkụ na-erepịa erepịa,
ọkụ nke na-ere ruo mgbe ebighị ebi?” 15Ndị na-ejegharị nʼezi omume
na-ekwu ihe ziri ezi,
ndị na-ajụ uru sitere nʼụzọ nʼezighị ezi,
ndị na-ewezuga aka ha site na ịnata ngarị dị iche iche,
ndị na-emechi ntị megide izu ịkwafu ọbara,
na-amụchi anya ha abụọ ka ha ghara ịtụgharị uche nʼihe ọjọọ. 16Ha bụ ndị ahụ ga-ebi nʼebe dị elu,
ndị ebe mgbaba ha ga-abụ ebe e wusiri ike nke ugwu.
A ga-enye ha nri,
mmiri a gaghị akọkwa ha. 17Anya unu ga-ahụ eze nʼebube ya;
unu ga-ahụkwa alaeze ya nke nsọtụ oke ya dị nʼebe dị anya. 18Nʼime echiche obi unu, unu ga na-atule ihe oke egwu nke oge ndị ahụ gara aga.
“Olee ebe onyeisi ọchịchị ahụ nọ ugbu a?
Ebee ka onye na-anakọta ụtụ ahụ nọ?
Ebeekwa ka onyeisi ahụ nke ụlọ elu nche niile dị nʼaka ya nọ?”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.