Native Bible

Isaiah 33:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼime echiche obi unu, unu ga na-atule ihe oke egwu nke oge ndị ahụ gara aga. “Olee ebe onyeisi ọchịchị ahụ nọ ugbu a? Ebee ka onye na-anakọta ụtụ ahụ nọ? Ebeekwa ka onyeisi ahụ nke ụlọ elu nche niile dị nʼaka ya nọ?”

Isaiah 33:18 in English

Isaiah 33:18 · Berean Standard Bible

Your mind will ponder the former terror: “Where is he who tallies? Where is he who weighs? Where is he who counts the towers?”

Context

16Ha bụ ndị ahụ ga-ebi nʼebe dị elu, ndị ebe mgbaba ha ga-abụ ebe e wusiri ike nke ugwu. A ga-enye ha nri, mmiri a gaghị akọkwa ha. 17Anya unu ga-ahụ eze nʼebube ya; unu ga-ahụkwa alaeze ya nke nsọtụ oke ya dị nʼebe dị anya. 18Nʼime echiche obi unu, unu ga na-atule ihe oke egwu nke oge ndị ahụ gara aga. “Olee ebe onyeisi ọchịchị ahụ nọ ugbu a? Ebee ka onye na-anakọta ụtụ ahụ nọ? Ebeekwa ka onyeisi ahụ nke ụlọ elu nche niile dị nʼaka ya nọ?” 19Nʼoge ahụ, unu agaghị ahụkwa ndị nganga ahụ ọzọ, bụ ndị ahụ na-asụ asụsụ nke unu na-amaghị, nke unu na-adịghị aghọtakwa. 20Lekwasịnụ Zayọn anya, obodo anyị na-anọ eme mmemme anyị niile; anya unu ga-ahụkwa Jerusalem, ụlọ obibi dị jụụ, ụlọ ikwu nke a na-apụghị ibupụ ebupụ; apụghịkwa iholite ǹtu jidere ya, maọbụ dọbie nke ọbụla nʼime ụdọ ji ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.