Aịzaya 33:18
Isaiah 33:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼime echiche obi unu, unu ga na-atule ihe oke egwu nke oge ndị ahụ gara aga. “Olee ebe onyeisi ọchịchị ahụ nọ ugbu a? Ebee ka onye na-anakọta ụtụ ahụ nọ? Ebeekwa ka onyeisi ahụ nke ụlọ elu nche niile dị nʼaka ya nọ?”
Isaiah 33:18 in English
Isaiah 33:18 · Berean Standard Bible
Your mind will ponder the former terror: “Where is he who tallies? Where is he who weighs? Where is he who counts the towers?”
Context
16Ha bụ ndị ahụ ga-ebi nʼebe dị elu,
ndị ebe mgbaba ha ga-abụ ebe e wusiri ike nke ugwu.
A ga-enye ha nri,
mmiri a gaghị akọkwa ha. 17Anya unu ga-ahụ eze nʼebube ya;
unu ga-ahụkwa alaeze ya nke nsọtụ oke ya dị nʼebe dị anya. 18Nʼime echiche obi unu, unu ga na-atule ihe oke egwu nke oge ndị ahụ gara aga.
“Olee ebe onyeisi ọchịchị ahụ nọ ugbu a?
Ebee ka onye na-anakọta ụtụ ahụ nọ?
Ebeekwa ka onyeisi ahụ nke ụlọ elu nche niile dị nʼaka ya nọ?” 19Nʼoge ahụ, unu agaghị ahụkwa ndị nganga ahụ ọzọ,
bụ ndị ahụ na-asụ asụsụ nke unu na-amaghị,
nke unu na-adịghị aghọtakwa. 20Lekwasịnụ Zayọn anya, obodo anyị na-anọ eme mmemme anyị niile;
anya unu ga-ahụkwa Jerusalem,
ụlọ obibi dị jụụ, ụlọ ikwu nke a na-apụghị ibupụ ebupụ;
apụghịkwa iholite ǹtu jidere ya,
maọbụ dọbie nke ọbụla nʼime ụdọ ji ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.