Native Bible

Isaiah 33:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Lekwasịnụ Zayọn anya, obodo anyị na-anọ eme mmemme anyị niile; anya unu ga-ahụkwa Jerusalem, ụlọ obibi dị jụụ, ụlọ ikwu nke a na-apụghị ibupụ ebupụ; apụghịkwa iholite ǹtu jidere ya, maọbụ dọbie nke ọbụla nʼime ụdọ ji ya.

Isaiah 33:20 in English

Isaiah 33:20 · Berean Standard Bible

Look upon Zion, the city of our appointed feasts. Your eyes will see Jerusalem, a peaceful pasture, a tent that does not wander; its tent pegs will not be pulled up, nor will any of its cords be broken.

Context

18Nʼime echiche obi unu, unu ga na-atule ihe oke egwu nke oge ndị ahụ gara aga. “Olee ebe onyeisi ọchịchị ahụ nọ ugbu a? Ebee ka onye na-anakọta ụtụ ahụ nọ? Ebeekwa ka onyeisi ahụ nke ụlọ elu nche niile dị nʼaka ya nọ?” 19Nʼoge ahụ, unu agaghị ahụkwa ndị nganga ahụ ọzọ, bụ ndị ahụ na-asụ asụsụ nke unu na-amaghị, nke unu na-adịghị aghọtakwa. 20Lekwasịnụ Zayọn anya, obodo anyị na-anọ eme mmemme anyị niile; anya unu ga-ahụkwa Jerusalem, ụlọ obibi dị jụụ, ụlọ ikwu nke a na-apụghị ibupụ ebupụ; apụghịkwa iholite ǹtu jidere ya, maọbụ dọbie nke ọbụla nʼime ụdọ ji ya. 21Ebe ahụ ka Onyenwe anyị ga-abụrụ anyị Onye dị ike. Ọ ga-adịkwara anyị ka osimiri na iyi dị obosara. Ọ dịghị ụgbọ amara maọbụ ụgbọ ukwu ga-abịa na mmiri ahụ. 22Nʼihi na Onyenwe anyị bụ onye ikpe anyị. Onyenwe anyị bụ onye na-enye anyị iwu. Onyenwe anyị bụ eze anyị, ọ bụ ya na-azọpụta anyị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.