Aịzaya 33:19
Isaiah 33:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼoge ahụ, unu agaghị ahụkwa ndị nganga ahụ ọzọ, bụ ndị ahụ na-asụ asụsụ nke unu na-amaghị, nke unu na-adịghị aghọtakwa.
Isaiah 33:19 in English
Isaiah 33:19 · Berean Standard Bible
You will no longer see the insolent, a people whose speech is unintelligible, who stammer in a language you cannot understand.
Context
17Anya unu ga-ahụ eze nʼebube ya;
unu ga-ahụkwa alaeze ya nke nsọtụ oke ya dị nʼebe dị anya. 18Nʼime echiche obi unu, unu ga na-atule ihe oke egwu nke oge ndị ahụ gara aga.
“Olee ebe onyeisi ọchịchị ahụ nọ ugbu a?
Ebee ka onye na-anakọta ụtụ ahụ nọ?
Ebeekwa ka onyeisi ahụ nke ụlọ elu nche niile dị nʼaka ya nọ?” 19Nʼoge ahụ, unu agaghị ahụkwa ndị nganga ahụ ọzọ,
bụ ndị ahụ na-asụ asụsụ nke unu na-amaghị,
nke unu na-adịghị aghọtakwa. 20Lekwasịnụ Zayọn anya, obodo anyị na-anọ eme mmemme anyị niile;
anya unu ga-ahụkwa Jerusalem,
ụlọ obibi dị jụụ, ụlọ ikwu nke a na-apụghị ibupụ ebupụ;
apụghịkwa iholite ǹtu jidere ya,
maọbụ dọbie nke ọbụla nʼime ụdọ ji ya. 21Ebe ahụ ka Onyenwe anyị ga-abụrụ anyị Onye dị ike.
Ọ ga-adịkwara anyị ka osimiri na iyi dị obosara.
Ọ dịghị ụgbọ amara
maọbụ ụgbọ ukwu ga-abịa na mmiri ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.