Aịzaya 33:17
Isaiah 33:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Anya unu ga-ahụ eze nʼebube ya; unu ga-ahụkwa alaeze ya nke nsọtụ oke ya dị nʼebe dị anya.
Isaiah 33:17 in English
Isaiah 33:17 · Berean Standard Bible
Your eyes will see the King in His beauty and behold a land that stretches afar.
Context
15Ndị na-ejegharị nʼezi omume
na-ekwu ihe ziri ezi,
ndị na-ajụ uru sitere nʼụzọ nʼezighị ezi,
ndị na-ewezuga aka ha site na ịnata ngarị dị iche iche,
ndị na-emechi ntị megide izu ịkwafu ọbara,
na-amụchi anya ha abụọ ka ha ghara ịtụgharị uche nʼihe ọjọọ. 16Ha bụ ndị ahụ ga-ebi nʼebe dị elu,
ndị ebe mgbaba ha ga-abụ ebe e wusiri ike nke ugwu.
A ga-enye ha nri,
mmiri a gaghị akọkwa ha. 17Anya unu ga-ahụ eze nʼebube ya;
unu ga-ahụkwa alaeze ya nke nsọtụ oke ya dị nʼebe dị anya. 18Nʼime echiche obi unu, unu ga na-atule ihe oke egwu nke oge ndị ahụ gara aga.
“Olee ebe onyeisi ọchịchị ahụ nọ ugbu a?
Ebee ka onye na-anakọta ụtụ ahụ nọ?
Ebeekwa ka onyeisi ahụ nke ụlọ elu nche niile dị nʼaka ya nọ?” 19Nʼoge ahụ, unu agaghị ahụkwa ndị nganga ahụ ọzọ,
bụ ndị ahụ na-asụ asụsụ nke unu na-amaghị,
nke unu na-adịghị aghọtakwa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.