Aịzaya 22:19
Isaiah 22:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị ga-achụpụkwa gị site nʼọkwa gị, na sitekwa nʼọnọdụ gị dị elu, dọda gị nʼala.
Isaiah 22:19 in English
Isaiah 22:19 · Berean Standard Bible
I will remove you from office, and you will be ousted from your position.
Context
17“Kpachara anya, Onyenwe anyị na-aga ịkpata gị aka,
tufuo gị nʼebe dị anya, gị dike na nwoke. 18Ọ ga-afịkọta gị okirikiri dịka bọlụ,
tufuo gị nʼobodo sara mbara.
Nʼebe ahụ ka ị ga-anọ nwụọ,
nʼebe ahụ kwa ka ụgbọala gị nke i ji anya isi
ga-aghọ ihe ihere nye ezinaụlọ onyenwe gị. 19Onyenwe anyị ga-achụpụkwa gị site nʼọkwa gị,
na sitekwa nʼọnọdụ gị dị elu, dọda gị nʼala. 20“Nʼụbọchị ahụ, aga m akpọ ohu m, Eliakịm, nwa Hilkaya. 21Aga m eyikwasị ya uwe ọrụ gị, kekwasịkwa ya ihe ike nʼukwu, werekwa ike ọchịchị ahụ i nwere na mbụ nyefee ya. Ọ ga-abụkwara ndị Jerusalem na ndị Juda nna.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.