Native Bible

Isaiah 22:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Nʼụbọchị ahụ, aga m akpọ ohu m, Eliakịm, nwa Hilkaya.

Isaiah 22:20 in English

Isaiah 22:20 · Berean Standard Bible

On that day I will summon My servant, Eliakim son of Hilkiah.

Context

18Ọ ga-afịkọta gị okirikiri dịka bọlụ, tufuo gị nʼobodo sara mbara. Nʼebe ahụ ka ị ga-anọ nwụọ, nʼebe ahụ kwa ka ụgbọala gị nke i ji anya isi ga-aghọ ihe ihere nye ezinaụlọ onyenwe gị. 19Onyenwe anyị ga-achụpụkwa gị site nʼọkwa gị, na sitekwa nʼọnọdụ gị dị elu, dọda gị nʼala. 20“Nʼụbọchị ahụ, aga m akpọ ohu m, Eliakịm, nwa Hilkaya. 21Aga m eyikwasị ya uwe ọrụ gị, kekwasịkwa ya ihe ike nʼukwu, werekwa ike ọchịchị ahụ i nwere na mbụ nyefee ya. Ọ ga-abụkwara ndị Jerusalem na ndị Juda nna. 22Aga m enyefekwa ya nʼaka ihe ntụghe ụzọ nke ụlọ Devid. A ga-emeghe ihe niile ọ sị na a ga-emeghe, mechiekwa ihe niile ọ sị na a ga-emechi,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.