Native Bible

Isaiah 22:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ ga-afịkọta gị okirikiri dịka bọlụ, tufuo gị nʼobodo sara mbara. Nʼebe ahụ ka ị ga-anọ nwụọ, nʼebe ahụ kwa ka ụgbọala gị nke i ji anya isi ga-aghọ ihe ihere nye ezinaụlọ onyenwe gị.

Isaiah 22:18 in English

Isaiah 22:18 · Berean Standard Bible

roll you into a ball, and sling you into a wide land. There you will die, and there your glorious chariots will remain—a disgrace to the house of your master.

Context

16Gịnị ka ị na-eme nʼebe a, onye nyekwara gị ikike na i gwuwaara onwe gị ili nʼebe a, na-egwuwakwa ili gị nʼebe dị elu na-akapụtara onwe gị ebe izuike nʼime nkume ahụ? 17“Kpachara anya, Onyenwe anyị na-aga ịkpata gị aka, tufuo gị nʼebe dị anya, gị dike na nwoke. 18Ọ ga-afịkọta gị okirikiri dịka bọlụ, tufuo gị nʼobodo sara mbara. Nʼebe ahụ ka ị ga-anọ nwụọ, nʼebe ahụ kwa ka ụgbọala gị nke i ji anya isi ga-aghọ ihe ihere nye ezinaụlọ onyenwe gị. 19Onyenwe anyị ga-achụpụkwa gị site nʼọkwa gị, na sitekwa nʼọnọdụ gị dị elu, dọda gị nʼala. 20“Nʼụbọchị ahụ, aga m akpọ ohu m, Eliakịm, nwa Hilkaya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.