Aịzaya 22:16
Isaiah 22:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gịnị ka ị na-eme nʼebe a, onye nyekwara gị ikike na i gwuwaara onwe gị ili nʼebe a, na-egwuwakwa ili gị nʼebe dị elu na-akapụtara onwe gị ebe izuike nʼime nkume ahụ?
Isaiah 22:16 in English
Isaiah 22:16 · Berean Standard Bible
What are you doing here, and who authorized you to carve out a tomb for yourself here—to chisel your tomb in the height and cut your resting place in the rock?
Context
14Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ekpugheerala m mee ka m nụrụ, “Nʼezie, agaghị ekpuchiri unu mmehie a ruo ụbọchị unu ga-anwụ.” Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. 15Otu a ka Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, kwuru:
“Gaa, gwa odozi akụ a bụ Shebna,
nke bụ onye na-elekọta ụlọ ukwu eze: 16Gịnị ka ị na-eme nʼebe a, onye nyekwara gị ikike
na i gwuwaara onwe gị ili nʼebe a,
na-egwuwakwa ili gị nʼebe dị elu
na-akapụtara onwe gị ebe izuike nʼime nkume ahụ? 17“Kpachara anya, Onyenwe anyị na-aga ịkpata gị aka,
tufuo gị nʼebe dị anya, gị dike na nwoke. 18Ọ ga-afịkọta gị okirikiri dịka bọlụ,
tufuo gị nʼobodo sara mbara.
Nʼebe ahụ ka ị ga-anọ nwụọ,
nʼebe ahụ kwa ka ụgbọala gị nke i ji anya isi
ga-aghọ ihe ihere nye ezinaụlọ onyenwe gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.