Aịzaya 22:14
Isaiah 22:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ekpugheerala m mee ka m nụrụ, “Nʼezie, agaghị ekpuchiri unu mmehie a ruo ụbọchị unu ga-anwụ.” Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.
Isaiah 22:14 in English
Isaiah 22:14 · Berean Standard Bible
The LORD of Hosts has revealed in my hearing: “Until your dying day, this sin of yours will never be atoned for,” says the Lord GOD of Hosts.
Context
12Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,
kpọrọ unu ụbọchị ahụ
ka unu kwaa akwa, ruo ụjụ,
kpụchaa agịrị isi unu ma yirikwa akwa mkpe. 13Ma lee, e nwere obi ụtọ, na-egwuri egwu;
igbu ehi na igbu atụrụ,
iri anụ nakwa ịṅụ mmanya.
Unu na-asị, “Ka anyị rienụ, ṅụọkwanụ,
nʼihi na echi ka anyị ga-anwụ.” 14Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ekpugheerala m mee ka m nụrụ, “Nʼezie, agaghị ekpuchiri unu mmehie a ruo ụbọchị unu ga-anwụ.” Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. 15Otu a ka Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, kwuru:
“Gaa, gwa odozi akụ a bụ Shebna,
nke bụ onye na-elekọta ụlọ ukwu eze: 16Gịnị ka ị na-eme nʼebe a, onye nyekwara gị ikike
na i gwuwaara onwe gị ili nʼebe a,
na-egwuwakwa ili gị nʼebe dị elu
na-akapụtara onwe gị ebe izuike nʼime nkume ahụ?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.