Aịzaya 22:17
Isaiah 22:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Kpachara anya, Onyenwe anyị na-aga ịkpata gị aka, tufuo gị nʼebe dị anya, gị dike na nwoke.
Isaiah 22:17 in English
Isaiah 22:17 · Berean Standard Bible
Look, O mighty man! The LORD is about to shake you violently. He will take hold of you,
Context
15Otu a ka Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, kwuru:
“Gaa, gwa odozi akụ a bụ Shebna,
nke bụ onye na-elekọta ụlọ ukwu eze: 16Gịnị ka ị na-eme nʼebe a, onye nyekwara gị ikike
na i gwuwaara onwe gị ili nʼebe a,
na-egwuwakwa ili gị nʼebe dị elu
na-akapụtara onwe gị ebe izuike nʼime nkume ahụ? 17“Kpachara anya, Onyenwe anyị na-aga ịkpata gị aka,
tufuo gị nʼebe dị anya, gị dike na nwoke. 18Ọ ga-afịkọta gị okirikiri dịka bọlụ,
tufuo gị nʼobodo sara mbara.
Nʼebe ahụ ka ị ga-anọ nwụọ,
nʼebe ahụ kwa ka ụgbọala gị nke i ji anya isi
ga-aghọ ihe ihere nye ezinaụlọ onyenwe gị. 19Onyenwe anyị ga-achụpụkwa gị site nʼọkwa gị,
na sitekwa nʼọnọdụ gị dị elu, dọda gị nʼala.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.