Native Bible

Isaiah 22:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Aga m eyikwasị ya uwe ọrụ gị, kekwasịkwa ya ihe ike nʼukwu, werekwa ike ọchịchị ahụ i nwere na mbụ nyefee ya. Ọ ga-abụkwara ndị Jerusalem na ndị Juda nna.

Isaiah 22:21 in English

Isaiah 22:21 · Berean Standard Bible

I will clothe him with your robe and tie your sash around him. I will put your authority in his hand, and he will be a father to the dwellers of Jerusalem and to the house of Judah.

Context

19Onyenwe anyị ga-achụpụkwa gị site nʼọkwa gị, na sitekwa nʼọnọdụ gị dị elu, dọda gị nʼala. 20“Nʼụbọchị ahụ, aga m akpọ ohu m, Eliakịm, nwa Hilkaya. 21Aga m eyikwasị ya uwe ọrụ gị, kekwasịkwa ya ihe ike nʼukwu, werekwa ike ọchịchị ahụ i nwere na mbụ nyefee ya. Ọ ga-abụkwara ndị Jerusalem na ndị Juda nna. 22Aga m enyefekwa ya nʼaka ihe ntụghe ụzọ nke ụlọ Devid. A ga-emeghe ihe niile ọ sị na a ga-emeghe, mechiekwa ihe niile ọ sị na a ga-emechi, 23Aga m eme ka o guzosie ike dịka ǹtu a kpọgidere nʼaja ụlọ. Ocheeze ya ga-ewetara ụlọ nna ya nsọpụrụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.