Hosiya 5:8
Hosea 5:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Fụọ opi ike na Gibea, fụkwaa mpi anụ na Rema. Tie mkpu agha na Bet-Aven. Lee anya nʼazụ gị, Benjamin.
Hosea 5:8 in English
Hosea 5:8 · Berean Standard Bible
Blow the ram’s horn in Gibeah, the trumpet in Ramah; raise the battle cry in Beth-aven:* Lead on, O Benjamin!
Context
6Mgbe ha ga-eji igwe ewu na atụrụ ha na igwe ehi ha,
gaa ịchọ Onyenwe anyị,
ha agaghị achọta ya.
Nʼihi na o sitela nʼebe ha nọ wezuga onwe ya. 7Ha bụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị.
Ha mụrụ ụmụ a kwatara nʼiko.
Ugbu a, mmemme ọnwa ọhụrụ ha
ga-eripịa ha na ala ubi ha. 8“Fụọ opi ike na Gibea,
fụkwaa mpi anụ na Rema.
Tie mkpu agha na Bet-Aven.
Lee anya nʼazụ gị, Benjamin. 9A ga-ebibi Ifrem kpamkpam
nʼụbọchị ahụ m ga-ata ha ahụhụ.*
Nʼetiti ebo nke Izrel niile,
ka m na-ekwusa ka amara na ọ bụ okwu kwesiri ntụkwasị obi.* 10Ndị ndu Juda adịla ka ndị ahụ
na-ewezuga oke ala,
aga m awụkwasị ha iwe m
dịka uju mmiri ozuzo.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.