Hosiya 5:10
Hosea 5:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị ndu Juda adịla ka ndị ahụ na-ewezuga oke ala, aga m awụkwasị ha iwe m dịka uju mmiri ozuzo.
Hosea 5:10 in English
Hosea 5:10 · Berean Standard Bible
The princes of Judah are like those who move boundary stones;* I will pour out My fury upon them like water.
Context
8“Fụọ opi ike na Gibea,
fụkwaa mpi anụ na Rema.
Tie mkpu agha na Bet-Aven.
Lee anya nʼazụ gị, Benjamin. 9A ga-ebibi Ifrem kpamkpam
nʼụbọchị ahụ m ga-ata ha ahụhụ.*
Nʼetiti ebo nke Izrel niile,
ka m na-ekwusa ka amara na ọ bụ okwu kwesiri ntụkwasị obi.* 10Ndị ndu Juda adịla ka ndị ahụ
na-ewezuga oke ala,
aga m awụkwasị ha iwe m
dịka uju mmiri ozuzo. 11Ifrem bụ onye a na-emegbu emegbu,
onye e ji ike na-azọpịa,
nʼihi na ọ kpacha anya na-achụso ihe efu. 12Adị m ka nla nye Ifrem,
dịkwa ka ihe na-eweta ire ure dịịrị ndị Juda.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.