Native Bible

Hosea 5:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Adị m ka nla nye Ifrem, dịkwa ka ihe na-eweta ire ure dịịrị ndị Juda.

Hosea 5:12 in English

Hosea 5:12 · Berean Standard Bible

So I am like a moth to Ephraim, and like decay to the house of Judah.

Context

10Ndị ndu Juda adịla ka ndị ahụ na-ewezuga oke ala, aga m awụkwasị ha iwe m dịka uju mmiri ozuzo. 11Ifrem bụ onye a na-emegbu emegbu, onye e ji ike na-azọpịa, nʼihi na ọ kpacha anya na-achụso ihe efu. 12Adị m ka nla nye Ifrem, dịkwa ka ihe na-eweta ire ure dịịrị ndị Juda. 13“Mgbe Ifrem hụrụ ụdị ọrịa ọ na-arịa, Juda ahụkwa ọnya dị ya nʼahụ, mgbe ahụ Ifrem gakwuru ndị Asịrịa, ma zigakwara eze ukwu ahụ ozi. Ma ọ pụghị ịgwọ gị, maọbụ gwọọ ọnya gị niile. 14Nʼihi na-aga m adị ka ọdụm nye Ifrem dịkwa ka nwa ọdụm nye Juda. Aga m adọkasị anụ ahụ ha ma hapụ ha pụọ. Aga m ebupụ ha pụọ, na-enweghị onye ga-abịa ịzọpụta ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.