Hosiya 5:11
Hosea 5:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ifrem bụ onye a na-emegbu emegbu, onye e ji ike na-azọpịa, nʼihi na ọ kpacha anya na-achụso ihe efu.
Hosea 5:11 in English
Hosea 5:11 · Berean Standard Bible
Ephraim is oppressed, crushed in judgment, for he is determined to follow worthless idols.*
Context
9A ga-ebibi Ifrem kpamkpam
nʼụbọchị ahụ m ga-ata ha ahụhụ.*
Nʼetiti ebo nke Izrel niile,
ka m na-ekwusa ka amara na ọ bụ okwu kwesiri ntụkwasị obi.* 10Ndị ndu Juda adịla ka ndị ahụ
na-ewezuga oke ala,
aga m awụkwasị ha iwe m
dịka uju mmiri ozuzo. 11Ifrem bụ onye a na-emegbu emegbu,
onye e ji ike na-azọpịa,
nʼihi na ọ kpacha anya na-achụso ihe efu. 12Adị m ka nla nye Ifrem,
dịkwa ka ihe na-eweta ire ure dịịrị ndị Juda. 13“Mgbe Ifrem hụrụ ụdị ọrịa ọ na-arịa,
Juda ahụkwa ọnya dị ya nʼahụ,
mgbe ahụ Ifrem gakwuru ndị Asịrịa,
ma zigakwara eze ukwu ahụ ozi.
Ma ọ pụghị ịgwọ gị,
maọbụ gwọọ ọnya gị niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.