Native Bible

Hosea 5:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ha ga-eji igwe ewu na atụrụ ha na igwe ehi ha, gaa ịchọ Onyenwe anyị, ha agaghị achọta ya. Nʼihi na o sitela nʼebe ha nọ wezuga onwe ya.

Hosea 5:6 in English

Hosea 5:6 · Berean Standard Bible

They go with their flocks and herds to seek the LORD, but they do not find Him; He has withdrawn Himself from them.

Context

4“Omume ha agaghị ekwe ka ha laghachikwute Chineke ha, nʼihi na mmụọ nke ịkwa iko ewerela ute biri nʼime ha, ha amaghịkwa Onyenwe anyị. 5Mpako niile nke Izrel na-agba ama megide ha, Ọ bụladị Izrel na Ifrem na-asọ ngọngọ nʼime mmehie ha, Juda, nʼonwe ya, soo ha na-asọ ngọngọ. 6Mgbe ha ga-eji igwe ewu na atụrụ ha na igwe ehi ha, gaa ịchọ Onyenwe anyị, ha agaghị achọta ya. Nʼihi na o sitela nʼebe ha nọ wezuga onwe ya. 7Ha bụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị. Ha mụrụ ụmụ a kwatara nʼiko. Ugbu a, mmemme ọnwa ọhụrụ ha ga-eripịa ha na ala ubi ha. 8“Fụọ opi ike na Gibea, fụkwaa mpi anụ na Rema. Tie mkpu agha na Bet-Aven. Lee anya nʼazụ gị, Benjamin.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.