Hosiya 5:7
Hosea 5:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha bụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị. Ha mụrụ ụmụ a kwatara nʼiko. Ugbu a, mmemme ọnwa ọhụrụ ha ga-eripịa ha na ala ubi ha.
Hosea 5:7 in English
Hosea 5:7 · Berean Standard Bible
They have been unfaithful to the LORD; for they have borne illegitimate children. Now the New Moon * will devour them along with their land.
Context
5Mpako niile nke Izrel na-agba ama megide ha,
Ọ bụladị Izrel na Ifrem na-asọ ngọngọ nʼime mmehie ha,
Juda, nʼonwe ya, soo ha na-asọ ngọngọ. 6Mgbe ha ga-eji igwe ewu na atụrụ ha na igwe ehi ha,
gaa ịchọ Onyenwe anyị,
ha agaghị achọta ya.
Nʼihi na o sitela nʼebe ha nọ wezuga onwe ya. 7Ha bụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị.
Ha mụrụ ụmụ a kwatara nʼiko.
Ugbu a, mmemme ọnwa ọhụrụ ha
ga-eripịa ha na ala ubi ha. 8“Fụọ opi ike na Gibea,
fụkwaa mpi anụ na Rema.
Tie mkpu agha na Bet-Aven.
Lee anya nʼazụ gị, Benjamin. 9A ga-ebibi Ifrem kpamkpam
nʼụbọchị ahụ m ga-ata ha ahụhụ.*
Nʼetiti ebo nke Izrel niile,
ka m na-ekwusa ka amara na ọ bụ okwu kwesiri ntụkwasị obi.*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.