Hosiya 11:7
Hosea 11:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị m ekpebiela nʼobi ha ịhapụ m. Nʼagbanyeghị na ha na-akpọ m Chineke nke kachasị ihe niile elu, ma mụ onwe m agaghị ebuli ha elu nʼụzọ ọbụla.
Hosea 11:7 in English
Hosea 11:7 · Berean Standard Bible
My people are bent on turning from Me. Though they call to the Most High, He will by no means exalt them.
Context
5“Ọ bụ na ha agaghị alaghachi azụ nʼIjipt,
Asịrịa ọ gaghị abụ eze ha,
nʼihi na ha ajụla ịlọghachikwute m? 6Mma agha ga-efegharị nʼobodo ha niile,
ọ ga-eripịa ndị nchụaja na-agba afa,
ọ ga-eripịakwa nzube ọjọọ ha niile. 7Ndị m ekpebiela nʼobi ha ịhapụ m.
Nʼagbanyeghị na ha na-akpọ m Chineke nke kachasị ihe niile elu,
ma mụ onwe m agaghị ebuli ha elu nʼụzọ ọbụla. 8“M ga-esi aṅaa rara gị nye, gị Ifrem?
M ga-esi aṅaa rara gị nye, gị Izrel?
M ga-esi aṅaa mee gị ka ịdị ka Adma?
M ga-esi aṅaa meso gị dịka Zeboiim?
Obi m na-akwasị akwa ike nʼime m;
ọ na-agụsị m agụụ ike inyere unu aka. 9Agaghị m emezu iwe ọkụ m
maọbụ bibiekwa Ifrem ọzọ.
Nʼihi na abụ m Chineke, abụghị m mmadụ.
Abụ m Onye Nsọ na-ebi nʼetiti unu.
Agaghị m emegidekwa obodo ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.