Hosiya 11:8
Hosea 11:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“M ga-esi aṅaa rara gị nye, gị Ifrem? M ga-esi aṅaa rara gị nye, gị Izrel? M ga-esi aṅaa mee gị ka ịdị ka Adma? M ga-esi aṅaa meso gị dịka Zeboiim? Obi m na-akwasị akwa ike nʼime m; ọ na-agụsị m agụụ ike inyere unu aka.
Hosea 11:8 in English
Hosea 11:8 · Berean Standard Bible
How could I give you up, O Ephraim? How could I surrender you, O Israel? How could I make you like Admah? How could I treat you like Zeboiim? My heart is turned within Me; My compassion is stirred!
Context
6Mma agha ga-efegharị nʼobodo ha niile,
ọ ga-eripịa ndị nchụaja na-agba afa,
ọ ga-eripịakwa nzube ọjọọ ha niile. 7Ndị m ekpebiela nʼobi ha ịhapụ m.
Nʼagbanyeghị na ha na-akpọ m Chineke nke kachasị ihe niile elu,
ma mụ onwe m agaghị ebuli ha elu nʼụzọ ọbụla. 8“M ga-esi aṅaa rara gị nye, gị Ifrem?
M ga-esi aṅaa rara gị nye, gị Izrel?
M ga-esi aṅaa mee gị ka ịdị ka Adma?
M ga-esi aṅaa meso gị dịka Zeboiim?
Obi m na-akwasị akwa ike nʼime m;
ọ na-agụsị m agụụ ike inyere unu aka. 9Agaghị m emezu iwe ọkụ m
maọbụ bibiekwa Ifrem ọzọ.
Nʼihi na abụ m Chineke, abụghị m mmadụ.
Abụ m Onye Nsọ na-ebi nʼetiti unu.
Agaghị m emegidekwa obodo ha. 10Nʼihi na ha ga-agbaso Onyenwe anyị.
Ọ ga-agbọkwa ụja dịka ọdụm.
Mgbe ọ gbọrọ ụja,
ụmụ ya ga-eji ịma jijiji site nʼakụkụ ọdịda anyanwụ bịakwute ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.