Hosiya 11:10
Hosea 11:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na ha ga-agbaso Onyenwe anyị. Ọ ga-agbọkwa ụja dịka ọdụm. Mgbe ọ gbọrọ ụja, ụmụ ya ga-eji ịma jijiji site nʼakụkụ ọdịda anyanwụ bịakwute ya.
Hosea 11:10 in English
Hosea 11:10 · Berean Standard Bible
They will walk after the LORD; He will roar like a lion. When He roars, His children will come trembling from the west.
Context
8“M ga-esi aṅaa rara gị nye, gị Ifrem?
M ga-esi aṅaa rara gị nye, gị Izrel?
M ga-esi aṅaa mee gị ka ịdị ka Adma?
M ga-esi aṅaa meso gị dịka Zeboiim?
Obi m na-akwasị akwa ike nʼime m;
ọ na-agụsị m agụụ ike inyere unu aka. 9Agaghị m emezu iwe ọkụ m
maọbụ bibiekwa Ifrem ọzọ.
Nʼihi na abụ m Chineke, abụghị m mmadụ.
Abụ m Onye Nsọ na-ebi nʼetiti unu.
Agaghị m emegidekwa obodo ha. 10Nʼihi na ha ga-agbaso Onyenwe anyị.
Ọ ga-agbọkwa ụja dịka ọdụm.
Mgbe ọ gbọrọ ụja,
ụmụ ya ga-eji ịma jijiji site nʼakụkụ ọdịda anyanwụ bịakwute ya. 11Dịka igwe nnụnụ
ka ha ga-ama jijiji bịa site nʼIjipt,
dịka nduru ka ha ga-efelata site nʼAsịrịa.
Aga m eme ka ha biri nʼụlọ ha ọzọ,”
otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 12Ifrem e jirila okwu ụgha gbaa m gburugburu,
ezinaụlọ Izrel e jirila aghụghọ na-emeso m omume,
ma Juda nọsịrị ike nʼekweghị nchịkọta nʼebe Chineke nọ,
ọbụladị megide Onye Nsọ ahụ nke kwesiri ntụkwasị obi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.