Hosiya 11:9
Hosea 11:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Agaghị m emezu iwe ọkụ m maọbụ bibiekwa Ifrem ọzọ. Nʼihi na abụ m Chineke, abụghị m mmadụ. Abụ m Onye Nsọ na-ebi nʼetiti unu. Agaghị m emegidekwa obodo ha.
Hosea 11:9 in English
Hosea 11:9 · Berean Standard Bible
I will not execute the full fury of My anger; I will not turn back to destroy Ephraim. For I am God and not man— the Holy One among you— and I will not come in wrath.
Context
7Ndị m ekpebiela nʼobi ha ịhapụ m.
Nʼagbanyeghị na ha na-akpọ m Chineke nke kachasị ihe niile elu,
ma mụ onwe m agaghị ebuli ha elu nʼụzọ ọbụla. 8“M ga-esi aṅaa rara gị nye, gị Ifrem?
M ga-esi aṅaa rara gị nye, gị Izrel?
M ga-esi aṅaa mee gị ka ịdị ka Adma?
M ga-esi aṅaa meso gị dịka Zeboiim?
Obi m na-akwasị akwa ike nʼime m;
ọ na-agụsị m agụụ ike inyere unu aka. 9Agaghị m emezu iwe ọkụ m
maọbụ bibiekwa Ifrem ọzọ.
Nʼihi na abụ m Chineke, abụghị m mmadụ.
Abụ m Onye Nsọ na-ebi nʼetiti unu.
Agaghị m emegidekwa obodo ha. 10Nʼihi na ha ga-agbaso Onyenwe anyị.
Ọ ga-agbọkwa ụja dịka ọdụm.
Mgbe ọ gbọrọ ụja,
ụmụ ya ga-eji ịma jijiji site nʼakụkụ ọdịda anyanwụ bịakwute ya. 11Dịka igwe nnụnụ
ka ha ga-ama jijiji bịa site nʼIjipt,
dịka nduru ka ha ga-efelata site nʼAsịrịa.
Aga m eme ka ha biri nʼụlọ ha ọzọ,”
otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.