Hosiya 11:11
Hosea 11:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Dịka igwe nnụnụ ka ha ga-ama jijiji bịa site nʼIjipt, dịka nduru ka ha ga-efelata site nʼAsịrịa. Aga m eme ka ha biri nʼụlọ ha ọzọ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
Hosea 11:11 in English
Hosea 11:11 · Berean Standard Bible
They will come trembling like birds from Egypt and like doves from the land of Assyria. Then I will settle them in their homes, declares the LORD.
Context
9Agaghị m emezu iwe ọkụ m
maọbụ bibiekwa Ifrem ọzọ.
Nʼihi na abụ m Chineke, abụghị m mmadụ.
Abụ m Onye Nsọ na-ebi nʼetiti unu.
Agaghị m emegidekwa obodo ha. 10Nʼihi na ha ga-agbaso Onyenwe anyị.
Ọ ga-agbọkwa ụja dịka ọdụm.
Mgbe ọ gbọrọ ụja,
ụmụ ya ga-eji ịma jijiji site nʼakụkụ ọdịda anyanwụ bịakwute ya. 11Dịka igwe nnụnụ
ka ha ga-ama jijiji bịa site nʼIjipt,
dịka nduru ka ha ga-efelata site nʼAsịrịa.
Aga m eme ka ha biri nʼụlọ ha ọzọ,”
otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 12Ifrem e jirila okwu ụgha gbaa m gburugburu,
ezinaụlọ Izrel e jirila aghụghọ na-emeso m omume,
ma Juda nọsịrị ike nʼekweghị nchịkọta nʼebe Chineke nọ,
ọbụladị megide Onye Nsọ ahụ nke kwesiri ntụkwasị obi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.