Native Bible

Hosea 11:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mma agha ga-efegharị nʼobodo ha niile, ọ ga-eripịa ndị nchụaja na-agba afa, ọ ga-eripịakwa nzube ọjọọ ha niile.

Hosea 11:6 in English

Hosea 11:6 · Berean Standard Bible

A sword will flash through their cities; it will destroy the bars of their gates and consume them in their own plans.

Context

4Eji m ụdọ nke mmadụ bụ ebere, na ịhụnanya duo ya. Adịrị m ha dịka onye nʼebuli ibu arọ site nʼolu ha, ehulatakwara m ala, were aka m tinye ha nri nʼọnụ. 5“Ọ bụ na ha agaghị alaghachi azụ nʼIjipt, Asịrịa ọ gaghị abụ eze ha, nʼihi na ha ajụla ịlọghachikwute m? 6Mma agha ga-efegharị nʼobodo ha niile, ọ ga-eripịa ndị nchụaja na-agba afa, ọ ga-eripịakwa nzube ọjọọ ha niile. 7Ndị m ekpebiela nʼobi ha ịhapụ m. Nʼagbanyeghị na ha na-akpọ m Chineke nke kachasị ihe niile elu, ma mụ onwe m agaghị ebuli ha elu nʼụzọ ọbụla. 8“M ga-esi aṅaa rara gị nye, gị Ifrem? M ga-esi aṅaa rara gị nye, gị Izrel? M ga-esi aṅaa mee gị ka ịdị ka Adma? M ga-esi aṅaa meso gị dịka Zeboiim? Obi m na-akwasị akwa ike nʼime m; ọ na-agụsị m agụụ ike inyere unu aka.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.