Hosiya 11:5
Hosea 11:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ọ bụ na ha agaghị alaghachi azụ nʼIjipt, Asịrịa ọ gaghị abụ eze ha, nʼihi na ha ajụla ịlọghachikwute m?
Hosea 11:5 in English
Hosea 11:5 · Berean Standard Bible
Will they not return to the land of Egypt and be ruled by Assyria because they refused to repent?
Context
3Ọ bụ mụ onwe m kuziiri Ifrem otu e si aga ije,
ejidere m ha nʼaka m abụọ,
ma ha amaghị
na ọ bụ mụ onwe m gwọrọ ya. 4Eji m ụdọ nke mmadụ bụ ebere,
na ịhụnanya duo ya.
Adịrị m ha dịka onye nʼebuli
ibu arọ site nʼolu ha,
ehulatakwara m ala, were aka m tinye ha nri nʼọnụ. 5“Ọ bụ na ha agaghị alaghachi azụ nʼIjipt,
Asịrịa ọ gaghị abụ eze ha,
nʼihi na ha ajụla ịlọghachikwute m? 6Mma agha ga-efegharị nʼobodo ha niile,
ọ ga-eripịa ndị nchụaja na-agba afa,
ọ ga-eripịakwa nzube ọjọọ ha niile. 7Ndị m ekpebiela nʼobi ha ịhapụ m.
Nʼagbanyeghị na ha na-akpọ m Chineke nke kachasị ihe niile elu,
ma mụ onwe m agaghị ebuli ha elu nʼụzọ ọbụla.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.