Hosiya 11:3
Hosea 11:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụ mụ onwe m kuziiri Ifrem otu e si aga ije, ejidere m ha nʼaka m abụọ, ma ha amaghị na ọ bụ mụ onwe m gwọrọ ya.
Hosea 11:3 in English
Hosea 11:3 · Berean Standard Bible
It was I who taught Ephraim * to walk, taking them in My arms, but they never realized that it was I who healed them.
Context
1“Mgbe Izrel bụ nwantakịrị, ahụrụ m ya nʼanya,
ọ bụkwa site nʼIjipt ka m kpọpụtara nwa m. 2Ma dịka m na-akpọ ha,
otu a ka ha na-aga nʼebe dị anya site nʼebe m nọ.
Ha chụrụ Baal aja,
surekwa aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye arụsị dị iche iche. 3Ọ bụ mụ onwe m kuziiri Ifrem otu e si aga ije,
ejidere m ha nʼaka m abụọ,
ma ha amaghị
na ọ bụ mụ onwe m gwọrọ ya. 4Eji m ụdọ nke mmadụ bụ ebere,
na ịhụnanya duo ya.
Adịrị m ha dịka onye nʼebuli
ibu arọ site nʼolu ha,
ehulatakwara m ala, were aka m tinye ha nri nʼọnụ. 5“Ọ bụ na ha agaghị alaghachi azụ nʼIjipt,
Asịrịa ọ gaghị abụ eze ha,
nʼihi na ha ajụla ịlọghachikwute m?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.