Native Bible

Hosea 11:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma dịka m na-akpọ ha, otu a ka ha na-aga nʼebe dị anya site nʼebe m nọ. Ha chụrụ Baal aja, surekwa aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye arụsị dị iche iche.

Hosea 11:2 in English

Hosea 11:2 · Berean Standard Bible

But the more I called Israel, the farther they departed from Me.* They sacrificed to the Baals and burned incense to carved images.

Context

1“Mgbe Izrel bụ nwantakịrị, ahụrụ m ya nʼanya, ọ bụkwa site nʼIjipt ka m kpọpụtara nwa m. 2Ma dịka m na-akpọ ha, otu a ka ha na-aga nʼebe dị anya site nʼebe m nọ. Ha chụrụ Baal aja, surekwa aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye arụsị dị iche iche. 3Ọ bụ mụ onwe m kuziiri Ifrem otu e si aga ije, ejidere m ha nʼaka m abụọ, ma ha amaghị na ọ bụ mụ onwe m gwọrọ ya. 4Eji m ụdọ nke mmadụ bụ ebere, na ịhụnanya duo ya. Adịrị m ha dịka onye nʼebuli ibu arọ site nʼolu ha, ehulatakwara m ala, were aka m tinye ha nri nʼọnụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.