Hosiya 11:4
Hosea 11:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Eji m ụdọ nke mmadụ bụ ebere, na ịhụnanya duo ya. Adịrị m ha dịka onye nʼebuli ibu arọ site nʼolu ha, ehulatakwara m ala, were aka m tinye ha nri nʼọnụ.
Hosea 11:4 in English
Hosea 11:4 · Berean Standard Bible
I led them with cords of kindness, with ropes of love; I lifted the yoke from their necks and bent down to feed them.
Context
2Ma dịka m na-akpọ ha,
otu a ka ha na-aga nʼebe dị anya site nʼebe m nọ.
Ha chụrụ Baal aja,
surekwa aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye arụsị dị iche iche. 3Ọ bụ mụ onwe m kuziiri Ifrem otu e si aga ije,
ejidere m ha nʼaka m abụọ,
ma ha amaghị
na ọ bụ mụ onwe m gwọrọ ya. 4Eji m ụdọ nke mmadụ bụ ebere,
na ịhụnanya duo ya.
Adịrị m ha dịka onye nʼebuli
ibu arọ site nʼolu ha,
ehulatakwara m ala, were aka m tinye ha nri nʼọnụ. 5“Ọ bụ na ha agaghị alaghachi azụ nʼIjipt,
Asịrịa ọ gaghị abụ eze ha,
nʼihi na ha ajụla ịlọghachikwute m? 6Mma agha ga-efegharị nʼobodo ha niile,
ọ ga-eripịa ndị nchụaja na-agba afa,
ọ ga-eripịakwa nzube ọjọọ ha niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.